Jonah 2

1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,
ọ zakwara m.
Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,
ị nụkwara olu akwa m.
3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,
nʼetiti oke osimiri.
Osimiri dịkwa m gburugburu,
ebili mmiri gị na mmali mmiri gị
gabigakwara m nʼisi.
4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị
chụpụ m;
ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ
nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,
ogbu mmiri na-erikpu m.
Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,
ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,
Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,
e chetara m gị Onyenwe anyị,
ma ekpere m bịakwutere gị,
nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,
na-agbakụta ebere Chineke azụ.
9Ma ọ bụ olu abụ ekele
ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.
Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.
Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”
10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Copyright information for IboBIU